Jeremaya 49:18
Jeremiah 49:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka a kwaturu Sọdọm na Gọmọra, ya na obodo niile gbara ya gburugburu. Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ; nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
Jeremiah 49:18 in English
Jeremiah 49:18 · Berean Standard Bible
As Sodom and Gomorrah were overthrown along with their neighbors,” says the LORD, “no one will dwell there; no man will abide there.
Context
16Ịdị egwu gị nke na-eyinye ndị mmadụ egwu,
na nganga nke obi gị eduhiela gị,
gị onye na-ebi na mgbawa niile nke nkume dị elu,
gị onye ji ebe niile dị elu nke ugwu nʼaka ya.
A sịkwarị na i wuo akwụ gị nʼebe dị elu, dịka ebe ugo ga-ewu akwụ ya,
aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala,
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 17“Edọm ga-aghọ ihe iju anya.
Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya,
ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile. 18Dịka a kwaturu Sọdọm na Gọmọra,
ya na obodo niile gbara ya gburugburu.
Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ;
nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 19“Aga m esi nʼala ya chụpụ Edọm nʼotu ntabi anya,
dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan
na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ.
Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka ya?
Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu?
Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?” 20Nʼihi nke a, nụrụ ihe Onyenwe anyị kwadobere megide Edọm,
nụrụkwa ihe o zubere megide ndị bi na Teman.
A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ,
ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.