Jeremaya 49:21
Jeremiah 49:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda ha; iti mkpu akwa ha ga-adakwa ụda ruo nʼOsimiri Uhie.
Jeremiah 49:21 in English
Jeremiah 49:21 · Berean Standard Bible
At the sound of their fall the earth will quake; their cry will resound to the Red Sea.*
Context
19“Aga m esi nʼala ya chụpụ Edọm nʼotu ntabi anya,
dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan
na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ.
Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka ya?
Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu?
Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?” 20Nʼihi nke a, nụrụ ihe Onyenwe anyị kwadobere megide Edọm,
nụrụkwa ihe o zubere megide ndị bi na Teman.
A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ,
ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a. 21Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda ha;
iti mkpu akwa ha ga-adakwa ụda ruo nʼOsimiri Uhie. 22Lee, otu ugo ga-efeli elu, fedatakwa.
Ọ ga-agbasapụ nku ya kpuchie ala Bozra niile.
Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bu dike nʼagha nʼEdọm
ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme. 23Nke dịrị Damaskọs:
“Ụjọ ejula Hamat na Apad obi,
nʼihi na ha anụla akụkọ ọjọọ.
Ha adaala mba,
nọọkwa nʼoke echiche dịka osimiri nke ebili na-amagharị nʼelu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.