Jeremaya 49:23
Jeremiah 49:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke dịrị Damaskọs: “Ụjọ ejula Hamat na Apad obi, nʼihi na ha anụla akụkọ ọjọọ. Ha adaala mba, nọọkwa nʼoke echiche dịka osimiri nke ebili na-amagharị nʼelu ya.
Jeremiah 49:23 in English
Jeremiah 49:23 · Berean Standard Bible
Concerning Damascus: “Hamath and Arpad are put to shame, for they have heard a bad report; they are agitated like the sea;* their anxiety cannot be calmed.
Context
21Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda ha;
iti mkpu akwa ha ga-adakwa ụda ruo nʼOsimiri Uhie. 22Lee, otu ugo ga-efeli elu, fedatakwa.
Ọ ga-agbasapụ nku ya kpuchie ala Bozra niile.
Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bu dike nʼagha nʼEdọm
ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme. 23Nke dịrị Damaskọs:
“Ụjọ ejula Hamat na Apad obi,
nʼihi na ha anụla akụkọ ọjọọ.
Ha adaala mba,
nọọkwa nʼoke echiche dịka osimiri nke ebili na-amagharị nʼelu ya. 24Damaskọs aghọọla onye ike gwụrụ.
Ọ tụgharịala ịgbapụ ọsọ,
ma ọma jijiji ejidela ya.
Oke obi ụfụ na ihe mgbu ejidesiela ya aka ike,
dịka obi ụfụ na ihe mgbu nke na-ejide nwanyị ime na-eme. 25Gịnị mere na-agbahapụbeghị obodo ahụ a maara aha ya,
bụ obodo ahụ nke ihe ya na-atọ obi m ụtọ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.