Jeremaya 49:25
Jeremiah 49:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị mere na-agbahapụbeghị obodo ahụ a maara aha ya, bụ obodo ahụ nke ihe ya na-atọ obi m ụtọ?
Jeremiah 49:25 in English
Jeremiah 49:25 · Berean Standard Bible
How is the city of praise not forsaken, the town that brings Me joy?
Context
23Nke dịrị Damaskọs:
“Ụjọ ejula Hamat na Apad obi,
nʼihi na ha anụla akụkọ ọjọọ.
Ha adaala mba,
nọọkwa nʼoke echiche dịka osimiri nke ebili na-amagharị nʼelu ya. 24Damaskọs aghọọla onye ike gwụrụ.
Ọ tụgharịala ịgbapụ ọsọ,
ma ọma jijiji ejidela ya.
Oke obi ụfụ na ihe mgbu ejidesiela ya aka ike,
dịka obi ụfụ na ihe mgbu nke na-ejide nwanyị ime na-eme. 25Gịnị mere na-agbahapụbeghị obodo ahụ a maara aha ya,
bụ obodo ahụ nke ihe ya na-atọ obi m ụtọ? 26Nʼezie, ụmụ okorobịa nọ nʼime ya ga-ada nʼokporoụzọ niile,
a ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. 27“Aga m esunye mgbidi Damaskọs ọkụ.
Ọkụ ahụ ga-eripịakwa ebe e wusiri ike nke Ben-Hadad.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.