Jeremaya 49:27
Jeremiah 49:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Aga m esunye mgbidi Damaskọs ọkụ. Ọkụ ahụ ga-eripịakwa ebe e wusiri ike nke Ben-Hadad.”
Jeremiah 49:27 in English
Jeremiah 49:27 · Berean Standard Bible
“I will set fire to the walls of Damascus; it will consume the fortresses of Ben-hadad.”
Context
25Gịnị mere na-agbahapụbeghị obodo ahụ a maara aha ya,
bụ obodo ahụ nke ihe ya na-atọ obi m ụtọ? 26Nʼezie, ụmụ okorobịa nọ nʼime ya ga-ada nʼokporoụzọ niile,
a ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. 27“Aga m esunye mgbidi Damaskọs ọkụ.
Ọkụ ahụ ga-eripịakwa ebe e wusiri ike nke Ben-Hadad.” 28Banyere Keda na alaeze Hazọ, nke Nebukadneza eze Babilọn busoro agha:
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Bilienụ gaa buso Keda agha.
Bibiekwanụ ndị ahụ niile bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. 29A ga-adọta ụlọ ikwu ha, na igwe ewu na atụrụ ha nʼagha.
A ga-ebukọrọkwa ụlọ mgbochi ha niile,
ya na ngwongwo na ịnyịnya kamel ha niile.
Ndị mmadụ ga-etikwa mkpu sị ha,
‘Oke egwu dị nʼakụkụ niile!’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.