Jeremaya 49:29
Jeremiah 49:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-adọta ụlọ ikwu ha, na igwe ewu na atụrụ ha nʼagha. A ga-ebukọrọkwa ụlọ mgbochi ha niile, ya na ngwongwo na ịnyịnya kamel ha niile. Ndị mmadụ ga-etikwa mkpu sị ha, ‘Oke egwu dị nʼakụkụ niile!’
Jeremiah 49:29 in English
Jeremiah 49:29 · Berean Standard Bible
They will take their tents and flocks, their tent curtains and all their goods. They will take their camels for themselves. They will shout to them: ‘Terror is on every side!’
Context
27“Aga m esunye mgbidi Damaskọs ọkụ.
Ọkụ ahụ ga-eripịakwa ebe e wusiri ike nke Ben-Hadad.” 28Banyere Keda na alaeze Hazọ, nke Nebukadneza eze Babilọn busoro agha:
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Bilienụ gaa buso Keda agha.
Bibiekwanụ ndị ahụ niile bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. 29A ga-adọta ụlọ ikwu ha, na igwe ewu na atụrụ ha nʼagha.
A ga-ebukọrọkwa ụlọ mgbochi ha niile,
ya na ngwongwo na ịnyịnya kamel ha niile.
Ndị mmadụ ga-etikwa mkpu sị ha,
‘Oke egwu dị nʼakụkụ niile!’ 30“Gbalaganụ ọsịịsọ.
Jeenụ nọdụ nʼime ọgba nkume niile miri emi, unu ndị niile bi na Hazọ,”
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Nebukadneza eze Babilọn atụọla atụmatụ megide unu,
o chepụtakwala ụzọ ọ ga-esi megide unu. 31“Bilienụ, gaa buso mba ahụ agha,
bụ mba ahụ na-ebi na ntụkwasị obi,”
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mba nke na-enweghị ibo ọnụ ụzọ, maọbụ mkpọrọ e ji akpọchi ya,
mba ahụ nke ndị ya na-ebiri naanị onwe ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.