Jeremaya 49:28
Jeremiah 49:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Banyere Keda na alaeze Hazọ, nke Nebukadneza eze Babilọn busoro agha: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Bilienụ gaa buso Keda agha. Bibiekwanụ ndị ahụ niile bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.
Jeremiah 49:28 in English
Jeremiah 49:28 · Berean Standard Bible
Concerning Kedar and the kingdoms of Hazor, which Nebuchadnezzar king of Babylon defeated, this is what the LORD says: “Rise up, advance against Kedar, and destroy the people of the east!
Context
26Nʼezie, ụmụ okorobịa nọ nʼime ya ga-ada nʼokporoụzọ niile,
a ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. 27“Aga m esunye mgbidi Damaskọs ọkụ.
Ọkụ ahụ ga-eripịakwa ebe e wusiri ike nke Ben-Hadad.” 28Banyere Keda na alaeze Hazọ, nke Nebukadneza eze Babilọn busoro agha:
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Bilienụ gaa buso Keda agha.
Bibiekwanụ ndị ahụ niile bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. 29A ga-adọta ụlọ ikwu ha, na igwe ewu na atụrụ ha nʼagha.
A ga-ebukọrọkwa ụlọ mgbochi ha niile,
ya na ngwongwo na ịnyịnya kamel ha niile.
Ndị mmadụ ga-etikwa mkpu sị ha,
‘Oke egwu dị nʼakụkụ niile!’ 30“Gbalaganụ ọsịịsọ.
Jeenụ nọdụ nʼime ọgba nkume niile miri emi, unu ndị niile bi na Hazọ,”
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Nebukadneza eze Babilọn atụọla atụmatụ megide unu,
o chepụtakwala ụzọ ọ ga-esi megide unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.