Native Bible

Jeremiah 49:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Bilienụ, gaa buso mba ahụ agha, bụ mba ahụ na-ebi na ntụkwasị obi,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mba nke na-enweghị ibo ọnụ ụzọ, maọbụ mkpọrọ e ji akpọchi ya, mba ahụ nke ndị ya na-ebiri naanị onwe ha.

Jeremiah 49:31 in English

Jeremiah 49:31 · Berean Standard Bible

Rise up, advance against a nation at ease, one that dwells securely,” declares the LORD. “They have no gates or bars; they live alone.

Context

29A ga-adọta ụlọ ikwu ha, na igwe ewu na atụrụ ha nʼagha. A ga-ebukọrọkwa ụlọ mgbochi ha niile, ya na ngwongwo na ịnyịnya kamel ha niile. Ndị mmadụ ga-etikwa mkpu sị ha, ‘Oke egwu dị nʼakụkụ niile!’ 30“Gbalaganụ ọsịịsọ. Jeenụ nọdụ nʼime ọgba nkume niile miri emi, unu ndị niile bi na Hazọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. Nebukadneza eze Babilọn atụọla atụmatụ megide unu, o chepụtakwala ụzọ ọ ga-esi megide unu. 31“Bilienụ, gaa buso mba ahụ agha, bụ mba ahụ na-ebi na ntụkwasị obi,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mba nke na-enweghị ibo ọnụ ụzọ, maọbụ mkpọrọ e ji akpọchi ya, mba ahụ nke ndị ya na-ebiri naanị onwe ha. 32Ịnyịnya kamel ha ga-abụ ihe a ga-akwata nʼagha, ọtụtụ igwe ehi ha ga-abụkwa ihe a ga-alụta nʼagha. Aga m efesa ha nye ifufe, bụ ndị niile nọ ebe dị anya, bụ ndị ahụ niile na-akpụchapụ agịrị isi egedege ihu ha. Aga m emekwa ka ihe ọjọọ si nʼakụkụ niile bịakwasị ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 33“Mgbe ahụ, Hazọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa. Ọ ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi. O nweghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ, nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.