Jeremaya 49:33
Jeremiah 49:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Mgbe ahụ, Hazọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa. Ọ ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi. O nweghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ, nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.”
Jeremiah 49:33 in English
Jeremiah 49:33 · Berean Standard Bible
“Hazor will become a haunt for jackals,* a desolation forever. No one will dwell there; no man will abide there.”
Context
31“Bilienụ, gaa buso mba ahụ agha,
bụ mba ahụ na-ebi na ntụkwasị obi,”
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mba nke na-enweghị ibo ọnụ ụzọ, maọbụ mkpọrọ e ji akpọchi ya,
mba ahụ nke ndị ya na-ebiri naanị onwe ha. 32Ịnyịnya kamel ha ga-abụ ihe a ga-akwata nʼagha,
ọtụtụ igwe ehi ha ga-abụkwa ihe a ga-alụta nʼagha.
Aga m efesa ha nye ifufe, bụ ndị niile nọ ebe dị anya, bụ ndị ahụ niile na-akpụchapụ agịrị isi egedege ihu ha.
Aga m emekwa ka ihe ọjọọ si nʼakụkụ niile bịakwasị ha,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 33“Mgbe ahụ, Hazọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa.
Ọ ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi.
O nweghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ,
nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.” 34Nke a bụ okwu Onyenwe anyị ndị ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Elam, mgbe Zedekaya eze Juda bidoro ọchịchị ya. 35Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Lee, aga m agbaji ụta nke Elam,
bụ ụta ahụ ha ji anya isi na ọ bụ ebe ike ha dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.