Jeremaya 49:34
Jeremiah 49:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ okwu Onyenwe anyị ndị ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Elam, mgbe Zedekaya eze Juda bidoro ọchịchị ya.
Jeremiah 49:34 in English
Jeremiah 49:34 · Berean Standard Bible
This is the word of the LORD that came to Jeremiah the prophet concerning Elam at the beginning of the reign of Zedekiah king of Judah.
Context
32Ịnyịnya kamel ha ga-abụ ihe a ga-akwata nʼagha,
ọtụtụ igwe ehi ha ga-abụkwa ihe a ga-alụta nʼagha.
Aga m efesa ha nye ifufe, bụ ndị niile nọ ebe dị anya, bụ ndị ahụ niile na-akpụchapụ agịrị isi egedege ihu ha.
Aga m emekwa ka ihe ọjọọ si nʼakụkụ niile bịakwasị ha,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 33“Mgbe ahụ, Hazọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa.
Ọ ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi.
O nweghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ,
nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.” 34Nke a bụ okwu Onyenwe anyị ndị ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Elam, mgbe Zedekaya eze Juda bidoro ọchịchị ya. 35Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Lee, aga m agbaji ụta nke Elam,
bụ ụta ahụ ha ji anya isi na ọ bụ ebe ike ha dị. 36Aga m esite nʼakụkụ anọ nke mbara eluigwe zite oke ifufe anọ,
nke ga-abịa megide Elam.
Aga m efesa ha nye oke ifufe anọ ndị a,
ndị ga-ebufu ha buga ha na mba niile dị iche iche,
ọ dịghị obodo a na-agaghị ahụ ndị Ilam a dọtara nʼagha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.