Jeremaya 49:9
Jeremiah 49:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na ndị na-aghọrọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị, ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole? Ọ bụrụkwa na ndị ohi abịa nʼabalị, ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-akwakọrọ?
Jeremiah 49:9 in English
Jeremiah 49:9 · Berean Standard Bible
If grape gatherers came to you, would they not leave some gleanings? Were thieves to come in the night, would they not steal only what they wanted?
Context
7Nke dịrị Edọm:
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Ọ pụtara na onye amamihe adịghịkwa na Teman?
Okwu ndụmọdụ ọ gwụla nʼọnụ ndị nwere nghọta?
Amamihe ha o reela ure? 8Chigharịanụ gbalaga, unu ndị bi na Dedan.
Gaa zoonụ onwe unu nʼọgba nkume miri emi,
nʼihi na aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị Ịsọ,
nʼoge ahụ m ga-ata ya ahụhụ. 9Ọ bụrụ na ndị na-aghọrọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị,
ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole?
Ọ bụrụkwa na ndị ohi abịa nʼabalị,
ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-akwakọrọ? 10Ma aga m agba Ịsọ ọtọ.*
Aga m ekpughe ebe nzuzo ya niile
ka ọ ghara izobe onwe ya.
Ụmụ ya na ndị ikwu ya,*
tinyere ndị ya na ha dị na mma na ndị agbataobi ya, ga-ala nʼiyi.
Ya mere, ọ dịghịkwa onye ga-asị, 11‘Hapụnụ ụmụ mgbei unu niile, nʼihi na mụ onwe m ga-edebe ha ndụ.
Ndị inyom unu niile ndị di ha nwụrụ nwere ike ịtụkwasị m obi.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.