Jeremaya 48:31
Jeremiah 48:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, aga m akwasị akwa ike nʼihi Moab, aga m eti mkpu akwa nʼihi ala Moab niile. Aga m asụ ude akwa nʼihi ndị Kia Hareset.
Jeremiah 48:31 in English
Jeremiah 48:31 · Berean Standard Bible
Therefore I will wail for Moab; I will cry out for all of Moab; I will moan for the men of Kir-heres.*
Context
29“Anyị anụla ihe banyere mpako Moab.
Anyị anụla na mpako ahụ dị ukwuu,
nụkwa ihe banyere oke mbuli elu nke ọ na-ebuli onwe ya,
na oke nganga nke obi ya. 30Amaara m ihe banyere mmụọ nke akpọghị onye ọzọ ihe ọbụla, nke dị nʼime ya, ma ọ gaghị abara ya uru ọbụla.
Ịnya isi ya agaghị arụpụtakwa ihe ọbụla, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 31Nʼihi ya, aga m akwasị akwa ike nʼihi Moab,
aga m eti mkpu akwa nʼihi ala Moab niile.
Aga m asụ ude akwa nʼihi ndị Kia Hareset. 32Akwa nke karịrị akwa Jeza ka m ga-akwa nʼihi gị,
gị osisi vaịnị dị na Sibma.
Alaka gị gbasara ruo nʼakụkụ osimiri,
e, ha gbasara ruo nʼosimiri Jeza.
Ma onye mbibi abịakwasịla mkpụrụ gị niile chara acha,
e, ọ bịakwasịla mkpụrụ vaịnị gị niile. 33Ọṅụ na obi ụtọ ka e wepụrụ
site nʼubi vaịnị niile, na nʼala ubi niile nke Moab.
E meela ka mmanya vaịnị kwụsị ịgbapụtakwa site nʼebe ịzọcha mmanya.
Ọ dịkwaghị onye na-eji mkpu ọṅụ na-azọcha ha,
Ọ bụ ezie na a na-anụ olu iti mkpu,
ma ọ bụghị olu iti mkpu ọṅụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.