Jeremaya 48:29
Jeremiah 48:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Anyị anụla ihe banyere mpako Moab. Anyị anụla na mpako ahụ dị ukwuu, nụkwa ihe banyere oke mbuli elu nke ọ na-ebuli onwe ya, na oke nganga nke obi ya.
Jeremiah 48:29 in English
Jeremiah 48:29 · Berean Standard Bible
We have heard of Moab’s pomposity, his exceeding pride and conceit, his proud arrogance and haughtiness of heart.
Context
27Izrel ọ bụghị ihe ọchị nye gị?
Ọ bụ nʼetiti ndị na-ezu ohi ka e jidere ya,
mere i ji na-efufere ya isi
mgbe ọbụla ị na-ekwu okwu banyere ya? 28Sitenụ nʼobodo unu niile gbapụ ọsọ; jeenụ biri nʼetiti nkume,
unu ndị bi nʼala Moab.
Dịrịnụ ka nduru nke na-ewu akwụ ya
nʼakụkụ ọnụ ọgba nkume. 29“Anyị anụla ihe banyere mpako Moab.
Anyị anụla na mpako ahụ dị ukwuu,
nụkwa ihe banyere oke mbuli elu nke ọ na-ebuli onwe ya,
na oke nganga nke obi ya. 30Amaara m ihe banyere mmụọ nke akpọghị onye ọzọ ihe ọbụla, nke dị nʼime ya, ma ọ gaghị abara ya uru ọbụla.
Ịnya isi ya agaghị arụpụtakwa ihe ọbụla, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 31Nʼihi ya, aga m akwasị akwa ike nʼihi Moab,
aga m eti mkpu akwa nʼihi ala Moab niile.
Aga m asụ ude akwa nʼihi ndị Kia Hareset.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.