Jeremaya 48:28
Jeremiah 48:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Sitenụ nʼobodo unu niile gbapụ ọsọ; jeenụ biri nʼetiti nkume, unu ndị bi nʼala Moab. Dịrịnụ ka nduru nke na-ewu akwụ ya nʼakụkụ ọnụ ọgba nkume.
Jeremiah 48:28 in English
Jeremiah 48:28 · Berean Standard Bible
Abandon the towns and settle among the rocks, O dwellers of Moab! Be like a dove that nests at the mouth of a cave.
Context
26“Meenụ ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke,
nʼihi na o nupuru isi megide Onyenwe anyị.
Moab ga-atụrụ onwe ya nʼihe ọ gbọrọ.
Ọ ga-aghọkwa ihe ọchị. 27Izrel ọ bụghị ihe ọchị nye gị?
Ọ bụ nʼetiti ndị na-ezu ohi ka e jidere ya,
mere i ji na-efufere ya isi
mgbe ọbụla ị na-ekwu okwu banyere ya? 28Sitenụ nʼobodo unu niile gbapụ ọsọ; jeenụ biri nʼetiti nkume,
unu ndị bi nʼala Moab.
Dịrịnụ ka nduru nke na-ewu akwụ ya
nʼakụkụ ọnụ ọgba nkume. 29“Anyị anụla ihe banyere mpako Moab.
Anyị anụla na mpako ahụ dị ukwuu,
nụkwa ihe banyere oke mbuli elu nke ọ na-ebuli onwe ya,
na oke nganga nke obi ya. 30Amaara m ihe banyere mmụọ nke akpọghị onye ọzọ ihe ọbụla, nke dị nʼime ya, ma ọ gaghị abara ya uru ọbụla.
Ịnya isi ya agaghị arụpụtakwa ihe ọbụla, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.