Native Bible

Jeremiah 48:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Sitenụ nʼobodo unu niile gbapụ ọsọ; jeenụ biri nʼetiti nkume, unu ndị bi nʼala Moab. Dịrịnụ ka nduru nke na-ewu akwụ ya nʼakụkụ ọnụ ọgba nkume.

Jeremiah 48:28 in English

Jeremiah 48:28 · Berean Standard Bible

Abandon the towns and settle among the rocks, O dwellers of Moab! Be like a dove that nests at the mouth of a cave.

Context

26“Meenụ ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke, nʼihi na o nupuru isi megide Onyenwe anyị. Moab ga-atụrụ onwe ya nʼihe ọ gbọrọ. Ọ ga-aghọkwa ihe ọchị. 27Izrel ọ bụghị ihe ọchị nye gị? Ọ bụ nʼetiti ndị na-ezu ohi ka e jidere ya, mere i ji na-efufere ya isi mgbe ọbụla ị na-ekwu okwu banyere ya? 28Sitenụ nʼobodo unu niile gbapụ ọsọ; jeenụ biri nʼetiti nkume, unu ndị bi nʼala Moab. Dịrịnụ ka nduru nke na-ewu akwụ ya nʼakụkụ ọnụ ọgba nkume. 29“Anyị anụla ihe banyere mpako Moab. Anyị anụla na mpako ahụ dị ukwuu, nụkwa ihe banyere oke mbuli elu nke ọ na-ebuli onwe ya, na oke nganga nke obi ya. 30Amaara m ihe banyere mmụọ nke akpọghị onye ọzọ ihe ọbụla, nke dị nʼime ya, ma ọ gaghị abara ya uru ọbụla. Ịnya isi ya agaghị arụpụtakwa ihe ọbụla, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.