Jeremaya 48:26
Jeremiah 48:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Meenụ ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke, nʼihi na o nupuru isi megide Onyenwe anyị. Moab ga-atụrụ onwe ya nʼihe ọ gbọrọ. Ọ ga-aghọkwa ihe ọchị.
Jeremiah 48:26 in English
Jeremiah 48:26 · Berean Standard Bible
“Make him drunk, because he has magnified himself against the LORD; so Moab will wallow in his own vomit, and he will also become a laughingstock.
Context
24Keriọt na Bozra,
na obodo niile dị nʼala Moab, ndị dị nso, na ndị nke dị anya. 25E bipụla mpi* Moab,
a gbajiekwala ogwe aka ya,”
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 26“Meenụ ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke,
nʼihi na o nupuru isi megide Onyenwe anyị.
Moab ga-atụrụ onwe ya nʼihe ọ gbọrọ.
Ọ ga-aghọkwa ihe ọchị. 27Izrel ọ bụghị ihe ọchị nye gị?
Ọ bụ nʼetiti ndị na-ezu ohi ka e jidere ya,
mere i ji na-efufere ya isi
mgbe ọbụla ị na-ekwu okwu banyere ya? 28Sitenụ nʼobodo unu niile gbapụ ọsọ; jeenụ biri nʼetiti nkume,
unu ndị bi nʼala Moab.
Dịrịnụ ka nduru nke na-ewu akwụ ya
nʼakụkụ ọnụ ọgba nkume.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.