Native Bible

Jeremiah 48:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E bipụla mpi* Moab, a gbajiekwala ogwe aka ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Jeremiah 48:25 in English

Jeremiah 48:25 · Berean Standard Bible

The horn of Moab has been cut off, and his arm is broken,” declares the LORD.

Context

23Kiriatem, Bet-Gamul na Bet-Meon, 24Keriọt na Bozra, na obodo niile dị nʼala Moab, ndị dị nso, na ndị nke dị anya. 25E bipụla mpi* Moab, a gbajiekwala ogwe aka ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 26“Meenụ ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke, nʼihi na o nupuru isi megide Onyenwe anyị. Moab ga-atụrụ onwe ya nʼihe ọ gbọrọ. Ọ ga-aghọkwa ihe ọchị. 27Izrel ọ bụghị ihe ọchị nye gị? Ọ bụ nʼetiti ndị na-ezu ohi ka e jidere ya, mere i ji na-efufere ya isi mgbe ọbụla ị na-ekwu okwu banyere ya?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.