Jeremaya 48:30
Jeremiah 48:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Amaara m ihe banyere mmụọ nke akpọghị onye ọzọ ihe ọbụla, nke dị nʼime ya, ma ọ gaghị abara ya uru ọbụla. Ịnya isi ya agaghị arụpụtakwa ihe ọbụla, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Jeremiah 48:30 in English
Jeremiah 48:30 · Berean Standard Bible
I know his insolence,” declares the LORD, “but it is futile. His boasting is as empty as his deeds.
Context
28Sitenụ nʼobodo unu niile gbapụ ọsọ; jeenụ biri nʼetiti nkume,
unu ndị bi nʼala Moab.
Dịrịnụ ka nduru nke na-ewu akwụ ya
nʼakụkụ ọnụ ọgba nkume. 29“Anyị anụla ihe banyere mpako Moab.
Anyị anụla na mpako ahụ dị ukwuu,
nụkwa ihe banyere oke mbuli elu nke ọ na-ebuli onwe ya,
na oke nganga nke obi ya. 30Amaara m ihe banyere mmụọ nke akpọghị onye ọzọ ihe ọbụla, nke dị nʼime ya, ma ọ gaghị abara ya uru ọbụla.
Ịnya isi ya agaghị arụpụtakwa ihe ọbụla, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 31Nʼihi ya, aga m akwasị akwa ike nʼihi Moab,
aga m eti mkpu akwa nʼihi ala Moab niile.
Aga m asụ ude akwa nʼihi ndị Kia Hareset. 32Akwa nke karịrị akwa Jeza ka m ga-akwa nʼihi gị,
gị osisi vaịnị dị na Sibma.
Alaka gị gbasara ruo nʼakụkụ osimiri,
e, ha gbasara ruo nʼosimiri Jeza.
Ma onye mbibi abịakwasịla mkpụrụ gị niile chara acha,
e, ọ bịakwasịla mkpụrụ vaịnị gị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.