Native Bible

Jeremiah 48:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Akwa nke karịrị akwa Jeza ka m ga-akwa nʼihi gị, gị osisi vaịnị dị na Sibma. Alaka gị gbasara ruo nʼakụkụ osimiri, e, ha gbasara ruo nʼosimiri Jeza. Ma onye mbibi abịakwasịla mkpụrụ gị niile chara acha, e, ọ bịakwasịla mkpụrụ vaịnị gị niile.

Jeremiah 48:32 in English

Jeremiah 48:32 · Berean Standard Bible

I will weep for you, O vine of Sibmah, more than I weep for Jazer. Your tendrils have extended to the sea;* they reach even to Jazer.* The destroyer has descended on your summer fruit and grape harvest.

Context

30Amaara m ihe banyere mmụọ nke akpọghị onye ọzọ ihe ọbụla, nke dị nʼime ya, ma ọ gaghị abara ya uru ọbụla. Ịnya isi ya agaghị arụpụtakwa ihe ọbụla, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 31Nʼihi ya, aga m akwasị akwa ike nʼihi Moab, aga m eti mkpu akwa nʼihi ala Moab niile. Aga m asụ ude akwa nʼihi ndị Kia Hareset. 32Akwa nke karịrị akwa Jeza ka m ga-akwa nʼihi gị, gị osisi vaịnị dị na Sibma. Alaka gị gbasara ruo nʼakụkụ osimiri, e, ha gbasara ruo nʼosimiri Jeza. Ma onye mbibi abịakwasịla mkpụrụ gị niile chara acha, e, ọ bịakwasịla mkpụrụ vaịnị gị niile. 33Ọṅụ na obi ụtọ ka e wepụrụ site nʼubi vaịnị niile, na nʼala ubi niile nke Moab. E meela ka mmanya vaịnị kwụsị ịgbapụtakwa site nʼebe ịzọcha mmanya. Ọ dịkwaghị onye na-eji mkpu ọṅụ na-azọcha ha, Ọ bụ ezie na a na-anụ olu iti mkpu, ma ọ bụghị olu iti mkpu ọṅụ. 34“A na-anụ ụda iti mkpu akwa ha site nʼobodo Heshbọn ruo Eleale, na Jehaz. A na-anụkwa ya site na Zoa ruo, ọ bụladị obodo ndị dị anya, dịka Horonaim, na Eglat Shelishiya. Nʼihi na mmiri niile nke Nimrim ataala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.