Native Bible

Jeremiah 46:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A ga-eme ka ihere mee Ada Ijipt, mgbe e nyefere ya nʼaka ndị si nʼakụkụ ugwu bịa.”

Jeremiah 46:24 in English

Jeremiah 46:24 · Berean Standard Bible

The Daughter of Egypt will be put to shame; she will be delivered into the hands of the people of the north.”

Context

22Ijipt ga-eme mkpọtụ, dịka mkpọtụ nke agwọ na-agba ọsọ na-eme, mgbe ndị iro ya ji ike na-abịakwasị ya. Ha ga-eji anyụike bịakwasị ya, dịka ndị na-egbutu osisi. 23Ha ga-egbutu oke ọhịa ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “nʼagbanyeghị na ọ bụ oke ọhịa rubigara oke. Ha dị ọtụtụ karịa igurube, a pụghịkwa ịgụta ole ha dị. 24A ga-eme ka ihere mee Ada Ijipt, mgbe e nyefere ya nʼaka ndị si nʼakụkụ ugwu bịa.” 25Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, sịrị, “Ana m aga ime ka ahụhụ bịakwasị Amọn, bụ chi ndị Tibs, na Fero, na ala Ijipt na chi niile dị nʼime ya, ndị eze ya niile nakwa ndị ahụ na-atụkwasị Fero obi. 26Aga m enyefe ha nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike, bụ Nebukadneza eze Babilọn, na ndịisi ọchịchị ya. Ma nʼikpeazụ, aga m emekwa ka ndị mmadụ birikwa nʼime ya ọzọ, dịka e si biri nʼime ya na mgbe ochie.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.