Jeremaya 46:25
Jeremiah 46:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, sịrị, “Ana m aga ime ka ahụhụ bịakwasị Amọn, bụ chi ndị Tibs, na Fero, na ala Ijipt na chi niile dị nʼime ya, ndị eze ya niile nakwa ndị ahụ na-atụkwasị Fero obi.
Jeremiah 46:25 in English
Jeremiah 46:25 · Berean Standard Bible
The LORD of Hosts, the God of Israel, says: “Behold, I am about to punish Amon god of Thebes,* along with Pharaoh, Egypt with her gods and kings, and those who trust in Pharaoh.
Context
23Ha ga-egbutu oke ọhịa ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“nʼagbanyeghị na ọ bụ oke ọhịa rubigara oke.
Ha dị ọtụtụ karịa igurube,
a pụghịkwa ịgụta ole ha dị. 24A ga-eme ka ihere mee Ada Ijipt,
mgbe e nyefere ya nʼaka ndị si nʼakụkụ ugwu bịa.” 25Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, sịrị, “Ana m aga ime ka ahụhụ bịakwasị Amọn, bụ chi ndị Tibs, na Fero, na ala Ijipt na chi niile dị nʼime ya, ndị eze ya niile nakwa ndị ahụ na-atụkwasị Fero obi. 26Aga m enyefe ha nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike, bụ Nebukadneza eze Babilọn, na ndịisi ọchịchị ya. Ma nʼikpeazụ, aga m emekwa ka ndị mmadụ birikwa nʼime ya ọzọ, dịka e si biri nʼime ya na mgbe ochie.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 27“Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m.
Adakwala mba, gị Izrel.
Nʼihi na lee, aghaghị m ịzọpụta gị site nʼebe dị anya nke e mere ka ị gaa biri.
Aga m azọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site nʼala ebe e mere ka ha gbapụ ọsọ gaa biri.
Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo, na-atụghị egwu ọbụla.
Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ọ tụọ ụjọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.