Native Bible

Jeremiah 46:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha ga-egbutu oke ọhịa ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “nʼagbanyeghị na ọ bụ oke ọhịa rubigara oke. Ha dị ọtụtụ karịa igurube, a pụghịkwa ịgụta ole ha dị.

Jeremiah 46:23 in English

Jeremiah 46:23 · Berean Standard Bible

They will chop down her forest, declares the LORD, dense though it may be, for they are more numerous than locusts; they cannot be counted.

Context

21Ndị agha e goro ego nọ nʼetiti ha dịka ụmụ ehi gbara abụba. Ha onwe ha kwa ga-atụgharịa gbaa ọsọ, ha agaghị eguzo, nʼihi na ụbọchị nhụju anya na-abịakwasị ha, bụ ụbọchị a ga-ata ha ahụhụ. 22Ijipt ga-eme mkpọtụ, dịka mkpọtụ nke agwọ na-agba ọsọ na-eme, mgbe ndị iro ya ji ike na-abịakwasị ya. Ha ga-eji anyụike bịakwasị ya, dịka ndị na-egbutu osisi. 23Ha ga-egbutu oke ọhịa ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “nʼagbanyeghị na ọ bụ oke ọhịa rubigara oke. Ha dị ọtụtụ karịa igurube, a pụghịkwa ịgụta ole ha dị. 24A ga-eme ka ihere mee Ada Ijipt, mgbe e nyefere ya nʼaka ndị si nʼakụkụ ugwu bịa.” 25Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, sịrị, “Ana m aga ime ka ahụhụ bịakwasị Amọn, bụ chi ndị Tibs, na Fero, na ala Ijipt na chi niile dị nʼime ya, ndị eze ya niile nakwa ndị ahụ na-atụkwasị Fero obi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.