Jeremaya 46:22
Jeremiah 46:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ijipt ga-eme mkpọtụ, dịka mkpọtụ nke agwọ na-agba ọsọ na-eme, mgbe ndị iro ya ji ike na-abịakwasị ya. Ha ga-eji anyụike bịakwasị ya, dịka ndị na-egbutu osisi.
Jeremiah 46:22 in English
Jeremiah 46:22 · Berean Standard Bible
Egypt will hiss like a fleeing serpent,* for the enemy will advance in force; with axes they will come against her like woodsmen cutting down trees.
Context
20“Ijipt mara mma dịka nne ehi,
ma ijiji* nke si nʼakụkụ ugwu,
na-abịa imegide ya. 21Ndị agha e goro ego nọ nʼetiti ha
dịka ụmụ ehi gbara abụba.
Ha onwe ha kwa ga-atụgharịa gbaa ọsọ,
ha agaghị eguzo,
nʼihi na ụbọchị nhụju anya na-abịakwasị ha,
bụ ụbọchị a ga-ata ha ahụhụ. 22Ijipt ga-eme mkpọtụ, dịka mkpọtụ nke agwọ na-agba ọsọ na-eme,
mgbe ndị iro ya ji ike na-abịakwasị ya.
Ha ga-eji anyụike bịakwasị ya,
dịka ndị na-egbutu osisi. 23Ha ga-egbutu oke ọhịa ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“nʼagbanyeghị na ọ bụ oke ọhịa rubigara oke.
Ha dị ọtụtụ karịa igurube,
a pụghịkwa ịgụta ole ha dị. 24A ga-eme ka ihere mee Ada Ijipt,
mgbe e nyefere ya nʼaka ndị si nʼakụkụ ugwu bịa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.