Jeremaya 46:20
Jeremiah 46:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ijipt mara mma dịka nne ehi, ma ijiji* nke si nʼakụkụ ugwu, na-abịa imegide ya.
Jeremiah 46:20 in English
Jeremiah 46:20 · Berean Standard Bible
Egypt is a beautiful heifer, but a gadfly from the north is coming against her.
Context
18“Dịka mụ onwe m na-adị ndụ,” ka Eze ahụ kwupụtara,
onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
“otu onye ga-abịa, onye dị ukwuu dịka ugwu Taboa si dị ukwuu nʼebe ugwu ndị ọzọ dị,
na dịka Kamel si dịrị nʼakụkụ osimiri. 19Kwakọtaanụ ngwongwo unu, jikerenụ maka ije biri nʼala ọzọ,
unu ndị bi nʼIjipt,
nʼihi na a ga-eme ka Memfis ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu.
Ọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ na-agaghị ebi nʼime ya. 20“Ijipt mara mma dịka nne ehi,
ma ijiji* nke si nʼakụkụ ugwu,
na-abịa imegide ya. 21Ndị agha e goro ego nọ nʼetiti ha
dịka ụmụ ehi gbara abụba.
Ha onwe ha kwa ga-atụgharịa gbaa ọsọ,
ha agaghị eguzo,
nʼihi na ụbọchị nhụju anya na-abịakwasị ha,
bụ ụbọchị a ga-ata ha ahụhụ. 22Ijipt ga-eme mkpọtụ, dịka mkpọtụ nke agwọ na-agba ọsọ na-eme,
mgbe ndị iro ya ji ike na-abịakwasị ya.
Ha ga-eji anyụike bịakwasị ya,
dịka ndị na-egbutu osisi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.