Native Bible

Jeremiah 46:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Kwakọtaanụ ngwongwo unu, jikerenụ maka ije biri nʼala ọzọ, unu ndị bi nʼIjipt, nʼihi na a ga-eme ka Memfis ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ na-agaghị ebi nʼime ya.

Jeremiah 46:19 in English

Jeremiah 46:19 · Berean Standard Bible

Pack your bags for exile, O daughter dwelling in Egypt! For Memphis will be laid waste, destroyed and uninhabited.

Context

17Nʼebe ahụ ka ha ga-anọ tie mkpu sị, ‘Fero eze Ijipt bụ naanị onye oke okwu. Lee, oge a kara aka nye ya efunarịla ya.’ 18“Dịka mụ onwe m na-adị ndụ,” ka Eze ahụ kwupụtara, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, “otu onye ga-abịa, onye dị ukwuu dịka ugwu Taboa si dị ukwuu nʼebe ugwu ndị ọzọ dị, na dịka Kamel si dịrị nʼakụkụ osimiri. 19Kwakọtaanụ ngwongwo unu, jikerenụ maka ije biri nʼala ọzọ, unu ndị bi nʼIjipt, nʼihi na a ga-eme ka Memfis ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ na-agaghị ebi nʼime ya. 20“Ijipt mara mma dịka nne ehi, ma ijiji* nke si nʼakụkụ ugwu, na-abịa imegide ya. 21Ndị agha e goro ego nọ nʼetiti ha dịka ụmụ ehi gbara abụba. Ha onwe ha kwa ga-atụgharịa gbaa ọsọ, ha agaghị eguzo, nʼihi na ụbọchị nhụju anya na-abịakwasị ha, bụ ụbọchị a ga-ata ha ahụhụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.