Jeremaya 4:9
Jeremiah 4:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼụbọchị ahụ,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Obi ndị eze na ndịisi ọchịchị ga-ada mba; ahụ ga-akpọnwụ ndị nchụaja, otu a kwa, ihe ga-eme ga-eju ndị amụma anya.”
Jeremiah 4:9 in English
Jeremiah 4:9 · Berean Standard Bible
“In that day,” declares the LORD, “the king and officials will lose their courage. The priests will tremble in fear, and the prophets will be astounded.”
Context
7Dịka ọdụm si nʼebe o zoro onwe ya amapụta,
ka onye a na-ebibi mba niile si abịa.
Ọ hapụla ebe obibi ya,
na-abịa ịla Juda nʼiyi.
Ọ ga-etidasị obodo niile nke Juda,
ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ha. 8Ya mere, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe;
kwaanụ akwa, tiekwanụ mkpu akwa,
nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị esitebeghị
nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya. 9“Nʼụbọchị ahụ,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“Obi ndị eze na ndịisi ọchịchị ga-ada mba;
ahụ ga-akpọnwụ ndị nchụaja,
otu a kwa, ihe ga-eme ga-eju ndị amụma anya.” 10Mgbe ahụ ekwuru m sị; “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị lee na ị ghọgbuola ndị a na Jerusalem site na ị sị, ‘Unu ga-enwe udo,’ mgbe mma agha dị anyị nʼolu.” 11Nʼoge ahụ, a ga-agwa ndị a na Jerusalem, “Ifufe dị ọkụ, nke sitere nʼebe dị elu ihe na-adịghị si nʼọzara na-efebata irute ndị m. Ma ọ bụghị ifufe maka ịfụcha, maọbụ ime ka adị ọcha,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.