Jeremaya 4:8
Jeremiah 4:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe; kwaanụ akwa, tiekwanụ mkpu akwa, nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị esitebeghị nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya.
Jeremiah 4:8 in English
Jeremiah 4:8 · Berean Standard Bible
So put on sackcloth, mourn and wail, for the fierce anger of the LORD has not turned away from us.”
Context
6Bulie ihe i gosi ụzọ ị ga Zayọn!
Gbaganụ zoo onwe unu. Unu atụfula oge!
Lee na mụ onwe m na-ewebata mbibi
na ịla nʼiyi site nʼakụkụ ugwu.” 7Dịka ọdụm si nʼebe o zoro onwe ya amapụta,
ka onye a na-ebibi mba niile si abịa.
Ọ hapụla ebe obibi ya,
na-abịa ịla Juda nʼiyi.
Ọ ga-etidasị obodo niile nke Juda,
ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ha. 8Ya mere, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe;
kwaanụ akwa, tiekwanụ mkpu akwa,
nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị esitebeghị
nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya. 9“Nʼụbọchị ahụ,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“Obi ndị eze na ndịisi ọchịchị ga-ada mba;
ahụ ga-akpọnwụ ndị nchụaja,
otu a kwa, ihe ga-eme ga-eju ndị amụma anya.” 10Mgbe ahụ ekwuru m sị; “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị lee na ị ghọgbuola ndị a na Jerusalem site na ị sị, ‘Unu ga-enwe udo,’ mgbe mma agha dị anyị nʼolu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.