Jeremaya 4:7
Jeremiah 4:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka ọdụm si nʼebe o zoro onwe ya amapụta, ka onye a na-ebibi mba niile si abịa. Ọ hapụla ebe obibi ya, na-abịa ịla Juda nʼiyi. Ọ ga-etidasị obodo niile nke Juda, ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ha.
Jeremiah 4:7 in English
Jeremiah 4:7 · Berean Standard Bible
A lion has gone up from his thicket, and a destroyer of nations has set out. He has left his lair to lay waste your land. Your cities will be reduced to ruins and lie uninhabited.
Context
5“Kwupụta ya na Juda, kwusaa ya na Jerusalem sị,
‘Fụọnụ opi nʼala ahụ niile.’
Tienụ mkpu nʼụzọ mmadụ ga-aghọta ya.
Gwanụ ndị Juda na Jerusalem ka ha zukọtaa
gbaga nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike. 6Bulie ihe i gosi ụzọ ị ga Zayọn!
Gbaganụ zoo onwe unu. Unu atụfula oge!
Lee na mụ onwe m na-ewebata mbibi
na ịla nʼiyi site nʼakụkụ ugwu.” 7Dịka ọdụm si nʼebe o zoro onwe ya amapụta,
ka onye a na-ebibi mba niile si abịa.
Ọ hapụla ebe obibi ya,
na-abịa ịla Juda nʼiyi.
Ọ ga-etidasị obodo niile nke Juda,
ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ha. 8Ya mere, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe;
kwaanụ akwa, tiekwanụ mkpu akwa,
nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị esitebeghị
nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya. 9“Nʼụbọchị ahụ,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“Obi ndị eze na ndịisi ọchịchị ga-ada mba;
ahụ ga-akpọnwụ ndị nchụaja,
otu a kwa, ihe ga-eme ga-eju ndị amụma anya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.