Jeremaya 4:5
Jeremiah 4:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Kwupụta ya na Juda, kwusaa ya na Jerusalem sị, ‘Fụọnụ opi nʼala ahụ niile.’ Tienụ mkpu nʼụzọ mmadụ ga-aghọta ya. Gwanụ ndị Juda na Jerusalem ka ha zukọtaa gbaga nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike.
Jeremiah 4:5 in English
Jeremiah 4:5 · Berean Standard Bible
Announce in Judah, proclaim in Jerusalem, and say: “Blow the ram’s horn throughout the land. Cry aloud and say, ‘Assemble yourselves and let us flee to the fortified cities.’
Context
3Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-agwa ndị Juda na Jerusalem sị,
“Kọzeenụ ala ubi unu nke unu na-akọbeghị;
unu akụnyela mkpụrụ ubi unu nʼetiti ogwu. 4Bienụ onwe unu ugwu nye Onyenwe anyị,
biekwanụ mkpụrụobi unu ugwu,
unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalem
ma ọ bụghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu dịka ọkụ,
nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere,
ọ ga-ere ma ọ dịkwaghị onye ga-emenyụ ya. 5“Kwupụta ya na Juda, kwusaa ya na Jerusalem sị,
‘Fụọnụ opi nʼala ahụ niile.’
Tienụ mkpu nʼụzọ mmadụ ga-aghọta ya.
Gwanụ ndị Juda na Jerusalem ka ha zukọtaa
gbaga nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike. 6Bulie ihe i gosi ụzọ ị ga Zayọn!
Gbaganụ zoo onwe unu. Unu atụfula oge!
Lee na mụ onwe m na-ewebata mbibi
na ịla nʼiyi site nʼakụkụ ugwu.” 7Dịka ọdụm si nʼebe o zoro onwe ya amapụta,
ka onye a na-ebibi mba niile si abịa.
Ọ hapụla ebe obibi ya,
na-abịa ịla Juda nʼiyi.
Ọ ga-etidasị obodo niile nke Juda,
ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.