Jeremaya 4:3
Jeremiah 4:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-agwa ndị Juda na Jerusalem sị, “Kọzeenụ ala ubi unu nke unu na-akọbeghị; unu akụnyela mkpụrụ ubi unu nʼetiti ogwu.
Jeremiah 4:3 in English
Jeremiah 4:3 · Berean Standard Bible
For this is what the LORD says to the men of Judah and Jerusalem: “Break up your unplowed ground, and do not sow among the thorns.
Context
1“Ọ bụrụ na unu bụ Izrel, ga-alọta, ka Onyenwe anyị kwubiri,
mụ ka ị ga-alọghachikwute,”
“Ọ bụrụ na unu ewezuga arụsị ndị ahụ rụrụ arụ site nʼihu m,
hapụ isi ebe m nọ kpafuo, 2ọ bụrụkwa na unu ga-eji eziokwu, ikpe ziri ezi na ụzọ ezi omume
ṅụọ iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’
mgbe ahụ mba niile ga-agọzi onwe ha site na ya
nyakwaa isi nʼime ya.” 3Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-agwa ndị Juda na Jerusalem sị,
“Kọzeenụ ala ubi unu nke unu na-akọbeghị;
unu akụnyela mkpụrụ ubi unu nʼetiti ogwu. 4Bienụ onwe unu ugwu nye Onyenwe anyị,
biekwanụ mkpụrụobi unu ugwu,
unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalem
ma ọ bụghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu dịka ọkụ,
nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere,
ọ ga-ere ma ọ dịkwaghị onye ga-emenyụ ya. 5“Kwupụta ya na Juda, kwusaa ya na Jerusalem sị,
‘Fụọnụ opi nʼala ahụ niile.’
Tienụ mkpu nʼụzọ mmadụ ga-aghọta ya.
Gwanụ ndị Juda na Jerusalem ka ha zukọtaa
gbaga nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.