Native Bible

Jeremiah 4:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Bulie ihe i gosi ụzọ ị ga Zayọn! Gbaganụ zoo onwe unu. Unu atụfula oge! Lee na mụ onwe m na-ewebata mbibi na ịla nʼiyi site nʼakụkụ ugwu.”

Jeremiah 4:6 in English

Jeremiah 4:6 · Berean Standard Bible

Raise a signal flag toward Zion. Seek refuge! Do not delay! For I am bringing disaster from the north, and terrible destruction.

Context

4Bienụ onwe unu ugwu nye Onyenwe anyị, biekwanụ mkpụrụobi unu ugwu, unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalem ma ọ bụghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu dịka ọkụ, nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere, ọ ga-ere ma ọ dịkwaghị onye ga-emenyụ ya. 5“Kwupụta ya na Juda, kwusaa ya na Jerusalem sị, ‘Fụọnụ opi nʼala ahụ niile.’ Tienụ mkpu nʼụzọ mmadụ ga-aghọta ya. Gwanụ ndị Juda na Jerusalem ka ha zukọtaa gbaga nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike. 6Bulie ihe i gosi ụzọ ị ga Zayọn! Gbaganụ zoo onwe unu. Unu atụfula oge! Lee na mụ onwe m na-ewebata mbibi na ịla nʼiyi site nʼakụkụ ugwu.” 7Dịka ọdụm si nʼebe o zoro onwe ya amapụta, ka onye a na-ebibi mba niile si abịa. Ọ hapụla ebe obibi ya, na-abịa ịla Juda nʼiyi. Ọ ga-etidasị obodo niile nke Juda, ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ha. 8Ya mere, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe; kwaanụ akwa, tiekwanụ mkpu akwa, nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị esitebeghị nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.