Jeremaya 4:6
Jeremiah 4:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Bulie ihe i gosi ụzọ ị ga Zayọn! Gbaganụ zoo onwe unu. Unu atụfula oge! Lee na mụ onwe m na-ewebata mbibi na ịla nʼiyi site nʼakụkụ ugwu.”
Jeremiah 4:6 in English
Jeremiah 4:6 · Berean Standard Bible
Raise a signal flag toward Zion. Seek refuge! Do not delay! For I am bringing disaster from the north, and terrible destruction.
Context
4Bienụ onwe unu ugwu nye Onyenwe anyị,
biekwanụ mkpụrụobi unu ugwu,
unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalem
ma ọ bụghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu dịka ọkụ,
nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere,
ọ ga-ere ma ọ dịkwaghị onye ga-emenyụ ya. 5“Kwupụta ya na Juda, kwusaa ya na Jerusalem sị,
‘Fụọnụ opi nʼala ahụ niile.’
Tienụ mkpu nʼụzọ mmadụ ga-aghọta ya.
Gwanụ ndị Juda na Jerusalem ka ha zukọtaa
gbaga nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike. 6Bulie ihe i gosi ụzọ ị ga Zayọn!
Gbaganụ zoo onwe unu. Unu atụfula oge!
Lee na mụ onwe m na-ewebata mbibi
na ịla nʼiyi site nʼakụkụ ugwu.” 7Dịka ọdụm si nʼebe o zoro onwe ya amapụta,
ka onye a na-ebibi mba niile si abịa.
Ọ hapụla ebe obibi ya,
na-abịa ịla Juda nʼiyi.
Ọ ga-etidasị obodo niile nke Juda,
ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ha. 8Ya mere, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe;
kwaanụ akwa, tiekwanụ mkpu akwa,
nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị esitebeghị
nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.