Jeremaya 4:11
Jeremiah 4:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge ahụ, a ga-agwa ndị a na Jerusalem, “Ifufe dị ọkụ, nke sitere nʼebe dị elu ihe na-adịghị si nʼọzara na-efebata irute ndị m. Ma ọ bụghị ifufe maka ịfụcha, maọbụ ime ka adị ọcha,
Jeremiah 4:11 in English
Jeremiah 4:11 · Berean Standard Bible
At that time it will be said to this people and to Jerusalem, “A searing wind from the barren heights in the desert blows toward the daughter of My people, but not to winnow or to sift;
Context
9“Nʼụbọchị ahụ,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“Obi ndị eze na ndịisi ọchịchị ga-ada mba;
ahụ ga-akpọnwụ ndị nchụaja,
otu a kwa, ihe ga-eme ga-eju ndị amụma anya.” 10Mgbe ahụ ekwuru m sị; “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị lee na ị ghọgbuola ndị a na Jerusalem site na ị sị, ‘Unu ga-enwe udo,’ mgbe mma agha dị anyị nʼolu.” 11Nʼoge ahụ, a ga-agwa ndị a na Jerusalem, “Ifufe dị ọkụ, nke sitere nʼebe dị elu ihe na-adịghị si nʼọzara na-efebata irute ndị m. Ma ọ bụghị ifufe maka ịfụcha, maọbụ ime ka adị ọcha, 12ọ bụ ifufe nke dị oke ike karịa nke na-esite na mụ. Ugbu a, ana m ekwupụta okwu ikpe m megide ha.” 13Lee anya, ha na-abịa dịka igwe ojii.
Ụgbọala agha ya na-abịa dịka oke ifufe,
ịnyịnya ha niile na-agbasikwa ọsọ ike karịa ugo.
Ahụhụ dịrị anyị, anyị abụrụla ndị e bibiri ebibi! Anyị abụrụla ndị na-aga ịla nʼiyi!
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.