Native Bible

Jeremiah 4:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ọ bụ ifufe nke dị oke ike karịa nke na-esite na mụ. Ugbu a, ana m ekwupụta okwu ikpe m megide ha.”

Jeremiah 4:12 in English

Jeremiah 4:12 · Berean Standard Bible

a wind too strong for that comes from Me. Now I also pronounce judgments against them.”

Context

10Mgbe ahụ ekwuru m sị; “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị lee na ị ghọgbuola ndị a na Jerusalem site na ị sị, ‘Unu ga-enwe udo,’ mgbe mma agha dị anyị nʼolu.” 11Nʼoge ahụ, a ga-agwa ndị a na Jerusalem, “Ifufe dị ọkụ, nke sitere nʼebe dị elu ihe na-adịghị si nʼọzara na-efebata irute ndị m. Ma ọ bụghị ifufe maka ịfụcha, maọbụ ime ka adị ọcha, 12ọ bụ ifufe nke dị oke ike karịa nke na-esite na mụ. Ugbu a, ana m ekwupụta okwu ikpe m megide ha.” 13Lee anya, ha na-abịa dịka igwe ojii. Ụgbọala agha ya na-abịa dịka oke ifufe, ịnyịnya ha niile na-agbasikwa ọsọ ike karịa ugo. Ahụhụ dịrị anyị, anyị abụrụla ndị e bibiri ebibi! Anyị abụrụla ndị na-aga ịla nʼiyi! 14Jerusalem, sachapụ mmehie dị gị nʼobi, ka a zọpụta gị. Ruo ole mgbe ka echiche mmehie ga-ejupụta gị obi?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.