Jeremaya 4:13
Jeremiah 4:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee anya, ha na-abịa dịka igwe ojii. Ụgbọala agha ya na-abịa dịka oke ifufe, ịnyịnya ha niile na-agbasikwa ọsọ ike karịa ugo. Ahụhụ dịrị anyị, anyị abụrụla ndị e bibiri ebibi! Anyị abụrụla ndị na-aga ịla nʼiyi!
Jeremiah 4:13 in English
Jeremiah 4:13 · Berean Standard Bible
Behold, he advances like the clouds, his chariots like the whirlwind. His horses are swifter than eagles. Woe to us, for we are ruined!
Context
11Nʼoge ahụ, a ga-agwa ndị a na Jerusalem, “Ifufe dị ọkụ, nke sitere nʼebe dị elu ihe na-adịghị si nʼọzara na-efebata irute ndị m. Ma ọ bụghị ifufe maka ịfụcha, maọbụ ime ka adị ọcha, 12ọ bụ ifufe nke dị oke ike karịa nke na-esite na mụ. Ugbu a, ana m ekwupụta okwu ikpe m megide ha.” 13Lee anya, ha na-abịa dịka igwe ojii.
Ụgbọala agha ya na-abịa dịka oke ifufe,
ịnyịnya ha niile na-agbasikwa ọsọ ike karịa ugo.
Ahụhụ dịrị anyị, anyị abụrụla ndị e bibiri ebibi! Anyị abụrụla ndị na-aga ịla nʼiyi! 14Jerusalem, sachapụ mmehie dị gị nʼobi, ka a zọpụta gị.
Ruo ole mgbe ka echiche mmehie ga-ejupụta gị obi? 15Otu olu na-akpọsa site na Dan,
ọ na-akpọsa ịla nʼiyi site nʼugwu niile nke Ifrem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.