Jeremaya 4:15
Jeremiah 4:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu olu na-akpọsa site na Dan, ọ na-akpọsa ịla nʼiyi site nʼugwu niile nke Ifrem.
Jeremiah 4:15 in English
Jeremiah 4:15 · Berean Standard Bible
For a voice resounds from Dan, proclaiming disaster from the hills of Ephraim.
Context
13Lee anya, ha na-abịa dịka igwe ojii.
Ụgbọala agha ya na-abịa dịka oke ifufe,
ịnyịnya ha niile na-agbasikwa ọsọ ike karịa ugo.
Ahụhụ dịrị anyị, anyị abụrụla ndị e bibiri ebibi! Anyị abụrụla ndị na-aga ịla nʼiyi! 14Jerusalem, sachapụ mmehie dị gị nʼobi, ka a zọpụta gị.
Ruo ole mgbe ka echiche mmehie ga-ejupụta gị obi? 15Otu olu na-akpọsa site na Dan,
ọ na-akpọsa ịla nʼiyi site nʼugwu niile nke Ifrem. 16“Gwa mba niile otu a, ha abịala,
kpọsaa banyere Jerusalem:
‘Ndị agha ga-agba gị gburugburu na-abịa site nʼala dị anya,
na-eti mkpu agha megide obodo niile nke Juda. 17Ha ga-agbakwa Jerusalem gburugburu dịka ndị agha na-eche ubi a gbara ogige nche,
nʼihi na ndị bi nʼime ya enupula isi megide m,’ ”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.