Jeremaya 4:17
Jeremiah 4:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-agbakwa Jerusalem gburugburu dịka ndị agha na-eche ubi a gbara ogige nche, nʼihi na ndị bi nʼime ya enupula isi megide m,’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Jeremiah 4:17 in English
Jeremiah 4:17 · Berean Standard Bible
They surround her like men guarding a field, because she has rebelled against Me,” declares the LORD.
Context
15Otu olu na-akpọsa site na Dan,
ọ na-akpọsa ịla nʼiyi site nʼugwu niile nke Ifrem. 16“Gwa mba niile otu a, ha abịala,
kpọsaa banyere Jerusalem:
‘Ndị agha ga-agba gị gburugburu na-abịa site nʼala dị anya,
na-eti mkpu agha megide obodo niile nke Juda. 17Ha ga-agbakwa Jerusalem gburugburu dịka ndị agha na-eche ubi a gbara ogige nche,
nʼihi na ndị bi nʼime ya enupula isi megide m,’ ”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 18“Ụzọ gị na omume gị niile
buteere gị ihe ndị a.
Nke a bụ ntaramahụhụ gị.
Lee ka o si dị ilu!
Lee ka o si emibanye nʼime obi.” 19Ihe mgbu a dị ukwuu.
Lee na apụghị m ịnagide ya.
Obi m o, obi m o!
Lee ka obi m si ada m gbim gbim gbim.
Apụghịkwa m ịnọ jụụ.
Ana m anụ ụda opi ike,
na-anụkwa ụzụ agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.