Jeremaya 4:16
Jeremiah 4:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gwa mba niile otu a, ha abịala, kpọsaa banyere Jerusalem: ‘Ndị agha ga-agba gị gburugburu na-abịa site nʼala dị anya, na-eti mkpu agha megide obodo niile nke Juda.
Jeremiah 4:16 in English
Jeremiah 4:16 · Berean Standard Bible
Warn the nations now! Proclaim to Jerusalem: “A besieging army comes from a distant land; they raise their voices against the cities of Judah.
Context
14Jerusalem, sachapụ mmehie dị gị nʼobi, ka a zọpụta gị.
Ruo ole mgbe ka echiche mmehie ga-ejupụta gị obi? 15Otu olu na-akpọsa site na Dan,
ọ na-akpọsa ịla nʼiyi site nʼugwu niile nke Ifrem. 16“Gwa mba niile otu a, ha abịala,
kpọsaa banyere Jerusalem:
‘Ndị agha ga-agba gị gburugburu na-abịa site nʼala dị anya,
na-eti mkpu agha megide obodo niile nke Juda. 17Ha ga-agbakwa Jerusalem gburugburu dịka ndị agha na-eche ubi a gbara ogige nche,
nʼihi na ndị bi nʼime ya enupula isi megide m,’ ”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 18“Ụzọ gị na omume gị niile
buteere gị ihe ndị a.
Nke a bụ ntaramahụhụ gị.
Lee ka o si dị ilu!
Lee ka o si emibanye nʼime obi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.