Jeremaya 4:18
Jeremiah 4:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ụzọ gị na omume gị niile buteere gị ihe ndị a. Nke a bụ ntaramahụhụ gị. Lee ka o si dị ilu! Lee ka o si emibanye nʼime obi.”
Jeremiah 4:18 in English
Jeremiah 4:18 · Berean Standard Bible
“Your ways and deeds have brought this upon you. This is your punishment; how bitter it is, because it pierces to the heart!”
Context
16“Gwa mba niile otu a, ha abịala,
kpọsaa banyere Jerusalem:
‘Ndị agha ga-agba gị gburugburu na-abịa site nʼala dị anya,
na-eti mkpu agha megide obodo niile nke Juda. 17Ha ga-agbakwa Jerusalem gburugburu dịka ndị agha na-eche ubi a gbara ogige nche,
nʼihi na ndị bi nʼime ya enupula isi megide m,’ ”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 18“Ụzọ gị na omume gị niile
buteere gị ihe ndị a.
Nke a bụ ntaramahụhụ gị.
Lee ka o si dị ilu!
Lee ka o si emibanye nʼime obi.” 19Ihe mgbu a dị ukwuu.
Lee na apụghị m ịnagide ya.
Obi m o, obi m o!
Lee ka obi m si ada m gbim gbim gbim.
Apụghịkwa m ịnọ jụụ.
Ana m anụ ụda opi ike,
na-anụkwa ụzụ agha. 20Mbibi na-arị mbibi ibe ya elu,
lee na a laala ala a niile nʼiyi.
Na mberede, e bibiela ụlọ ikwu anyị niile;
a dọkasịkwala akwa mgbochi ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.