Jeremaya 31:5
Jeremiah 31:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige nʼelu ugwu Sameria. Ndị ọrụ ubi kụrụ ya ga-erikwa mkpụrụ si na ya.
Jeremiah 31:5 in English
Jeremiah 31:5 · Berean Standard Bible
Again you will plant vineyards on the hills of Samaria; the farmers will plant and enjoy the fruit.
Context
3Onyenwe anyị mere ka anyị hụ ya anya site nʼebe dị anya, na-asị,
“Ọ bụ ịhụnanya nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi ka m ji hụ gị nʼanya;
Ọ bụ ebere nke na-adịghị agbanwe ka m ji dọta unu nso. 4Aga m ewulikwa gị elu ọzọ,
e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke.
Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọ
soro ndị ọṅụ juru obi tee egwu. 5Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige
nʼelu ugwu Sameria.
Ndị ọrụ ubi kụrụ ya
ga-erikwa mkpụrụ si na ya. 6Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ
nʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha,
‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn,
ka anyị jee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.’ ” 7Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb,
tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu.
Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ,
‘Onyenwe anyị, biko, zọpụta ndị gị,
bụ ndị Izrel fọdụrụ.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.