Jeremaya 31:6
Jeremiah 31:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ nʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha, ‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn, ka anyị jee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.’ ”
Jeremiah 31:6 in English
Jeremiah 31:6 · Berean Standard Bible
For there will be a day when watchmen will call out on the hills of Ephraim, ‘Arise, let us go up to Zion, to the LORD our God!’”
Context
4Aga m ewulikwa gị elu ọzọ,
e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke.
Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọ
soro ndị ọṅụ juru obi tee egwu. 5Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige
nʼelu ugwu Sameria.
Ndị ọrụ ubi kụrụ ya
ga-erikwa mkpụrụ si na ya. 6Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ
nʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha,
‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn,
ka anyị jee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.’ ” 7Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb,
tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu.
Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ,
‘Onyenwe anyị, biko, zọpụta ndị gị,
bụ ndị Izrel fọdụrụ.’ 8Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha;
aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha.
Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ,
na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme.
Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu!
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.