Jeremaya 31:8
Jeremiah 31:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha; aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha. Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ, na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme. Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu!
Jeremiah 31:8 in English
Jeremiah 31:8 · Berean Standard Bible
Behold, I will bring them from the land of the north and gather them from the farthest parts of the earth, including the blind and the lame, expectant mothers and women in labor. They will return as a great assembly!
Context
6Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ
nʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha,
‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn,
ka anyị jee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.’ ” 7Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb,
tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu.
Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ,
‘Onyenwe anyị, biko, zọpụta ndị gị,
bụ ndị Izrel fọdụrụ.’ 8Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha;
aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha.
Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ,
na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme.
Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu! 9Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta,
ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha.
Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi,
nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha,
nʼihi na aghọọlara m Izrel nna,
Ifrem bụkwa ọkpara m. 10“Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu mba niile;
kwusaanụ ya nʼebe dị anya nke ala ahụ dị nʼakụkụ osimiri niile.
Onye ahụ chụsara Izrel ga-achịkọtakwa ha.
Ọ ga-elekọtakwa igwe ewu na atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.