Jeremaya 31:10
Jeremiah 31:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu mba niile; kwusaanụ ya nʼebe dị anya nke ala ahụ dị nʼakụkụ osimiri niile. Onye ahụ chụsara Izrel ga-achịkọtakwa ha. Ọ ga-elekọtakwa igwe ewu na atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ.
Jeremiah 31:10 in English
Jeremiah 31:10 · Berean Standard Bible
Hear, O nations, the word of the LORD, and proclaim it in distant coastlands: “The One who scattered Israel will gather them and keep them as a shepherd keeps his flock.
Context
8Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha;
aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha.
Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ,
na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme.
Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu! 9Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta,
ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha.
Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi,
nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha,
nʼihi na aghọọlara m Izrel nna,
Ifrem bụkwa ọkpara m. 10“Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu mba niile;
kwusaanụ ya nʼebe dị anya nke ala ahụ dị nʼakụkụ osimiri niile.
Onye ahụ chụsara Izrel ga-achịkọtakwa ha.
Ọ ga-elekọtakwa igwe ewu na atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. 11Nʼihi na Onyenwe anyị ga-agbapụta Jekọb,
ọ ga-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ka ha ike. 12Ha ga-abịa nọọ nʼugwu Zayọn tie mkpu ọṅụ,
ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị ukwu nke ezi ihe Onyenwe anyị nyere ha,
dịka ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ,
na ụmụ igwe ewu na atụrụ, na ọtụtụ ehi.
Ha ga-adị ka ubi a na-agba mmiri mgbe niile;
ha agaghị erukwa ụjụ ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.