Jeremaya 31:11
Jeremiah 31:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na Onyenwe anyị ga-agbapụta Jekọb, ọ ga-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ka ha ike.
Jeremiah 31:11 in English
Jeremiah 31:11 · Berean Standard Bible
For the LORD has ransomed Jacob and redeemed him from the hand that had overpowered him.
Context
9Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta,
ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha.
Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi,
nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha,
nʼihi na aghọọlara m Izrel nna,
Ifrem bụkwa ọkpara m. 10“Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu mba niile;
kwusaanụ ya nʼebe dị anya nke ala ahụ dị nʼakụkụ osimiri niile.
Onye ahụ chụsara Izrel ga-achịkọtakwa ha.
Ọ ga-elekọtakwa igwe ewu na atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. 11Nʼihi na Onyenwe anyị ga-agbapụta Jekọb,
ọ ga-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ka ha ike. 12Ha ga-abịa nọọ nʼugwu Zayọn tie mkpu ọṅụ,
ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị ukwu nke ezi ihe Onyenwe anyị nyere ha,
dịka ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ,
na ụmụ igwe ewu na atụrụ, na ọtụtụ ehi.
Ha ga-adị ka ubi a na-agba mmiri mgbe niile;
ha agaghị erukwa ụjụ ọzọ. 13Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ,
ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-aṅụrịkwa ọṅụ.
Aga m eme ka iru ụjụ ha ghọọrọ ha obi ụtọ,
aga m enyekwa ha nkasiobi na ọṅụ nʼọnọdụ mwute.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.