Jeremaya 31:13
Jeremiah 31:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ, ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-aṅụrịkwa ọṅụ. Aga m eme ka iru ụjụ ha ghọọrọ ha obi ụtọ, aga m enyekwa ha nkasiobi na ọṅụ nʼọnọdụ mwute.
Jeremiah 31:13 in English
Jeremiah 31:13 · Berean Standard Bible
Then the maidens will rejoice with dancing, young men and old as well. I will turn their mourning into joy, and give them comfort and joy for their sorrow.
Context
11Nʼihi na Onyenwe anyị ga-agbapụta Jekọb,
ọ ga-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ka ha ike. 12Ha ga-abịa nọọ nʼugwu Zayọn tie mkpu ọṅụ,
ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị ukwu nke ezi ihe Onyenwe anyị nyere ha,
dịka ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ,
na ụmụ igwe ewu na atụrụ, na ọtụtụ ehi.
Ha ga-adị ka ubi a na-agba mmiri mgbe niile;
ha agaghị erukwa ụjụ ọzọ. 13Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ,
ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-aṅụrịkwa ọṅụ.
Aga m eme ka iru ụjụ ha ghọọrọ ha obi ụtọ,
aga m enyekwa ha nkasiobi na ọṅụ nʼọnọdụ mwute. 14Aga m emekwa ka afọ jubiga ndị nchụaja oke nʼihi ịdị ukwuu nke onyinye ha ga-enweta,
afọ ezi ihe m ga-ejukwa ndị m,”*
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 15Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
“A nụrụ otu olu na Rema,
iru ụjụ na oke ịkwa akwa.
Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya,
o kwekwaghị ịnabata nkasiobi a na-akasị ya,
nʼihi na ụmụ ya adịghịkwa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.