Jeremaya 31:15
Jeremiah 31:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “A nụrụ otu olu na Rema, iru ụjụ na oke ịkwa akwa. Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya, o kwekwaghị ịnabata nkasiobi a na-akasị ya, nʼihi na ụmụ ya adịghịkwa.”
Jeremiah 31:15 in English
Jeremiah 31:15 · Berean Standard Bible
This is what the LORD says: “A voice is heard in Ramah, mourning and great weeping, Rachel weeping for her children, and refusing to be comforted, because they are no more.”*
Context
13Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ,
ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-aṅụrịkwa ọṅụ.
Aga m eme ka iru ụjụ ha ghọọrọ ha obi ụtọ,
aga m enyekwa ha nkasiobi na ọṅụ nʼọnọdụ mwute. 14Aga m emekwa ka afọ jubiga ndị nchụaja oke nʼihi ịdị ukwuu nke onyinye ha ga-enweta,
afọ ezi ihe m ga-ejukwa ndị m,”*
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 15Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
“A nụrụ otu olu na Rema,
iru ụjụ na oke ịkwa akwa.
Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya,
o kwekwaghị ịnabata nkasiobi a na-akasị ya,
nʼihi na ụmụ ya adịghịkwa.” 16Ma otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Jide olu gị aka, ka ọ ghara ịkwa akwa,
jidekwa anya gị abụọ, ka ha ghara ịgba anya mmiri,
nʼihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ gị.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ha ga-esite nʼala ndị iro ha lọtakwa. 17Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala nke aka ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.