Jeremaya 31:17
Jeremiah 31:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala nke aka ha.
Jeremiah 31:17 in English
Jeremiah 31:17 · Berean Standard Bible
So there is hope for your future, declares the LORD, and your children will return to their own land.
Context
15Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
“A nụrụ otu olu na Rema,
iru ụjụ na oke ịkwa akwa.
Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya,
o kwekwaghị ịnabata nkasiobi a na-akasị ya,
nʼihi na ụmụ ya adịghịkwa.” 16Ma otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Jide olu gị aka, ka ọ ghara ịkwa akwa,
jidekwa anya gị abụọ, ka ha ghara ịgba anya mmiri,
nʼihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ gị.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ha ga-esite nʼala ndị iro ha lọtakwa. 17Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala nke aka ha. 18“Anụla m nnọọ ịsụ ude Ifrem, na okwu o kwuru sị,
‘Ị dọọla m aka na ntị dịka nwa ehi nke na-eme isiike.
Lee, amụtala m ihe ị chọrọ ka m mụta site nʼịdọ aka na ntị gị.
Ya mere, kpọlata m, ka m nwee ike lọtakwa,
nʼihi na ị bụ Onyenwe anyị na Chineke m. 19Mgbe m kpafuru,
echegharịrị m.
Mgbe m ghọtakwara,
e tiri m aka nʼobi m,
ihere mere m, ọ wutekwara m
nʼihi nʼọnọdụ ihe ihere nʼihi ụdị ndụ m biri nʼokorobịa m.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.