Jeremaya 31:19
Jeremiah 31:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe m kpafuru, echegharịrị m. Mgbe m ghọtakwara, e tiri m aka nʼobi m, ihere mere m, ọ wutekwara m nʼihi nʼọnọdụ ihe ihere nʼihi ụdị ndụ m biri nʼokorobịa m.’
Jeremiah 31:19 in English
Jeremiah 31:19 · Berean Standard Bible
After I returned, I repented; and after I was instructed, I struck my thigh in grief. I was ashamed and humiliated because I bore the disgrace of my youth.’
Context
17Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala nke aka ha. 18“Anụla m nnọọ ịsụ ude Ifrem, na okwu o kwuru sị,
‘Ị dọọla m aka na ntị dịka nwa ehi nke na-eme isiike.
Lee, amụtala m ihe ị chọrọ ka m mụta site nʼịdọ aka na ntị gị.
Ya mere, kpọlata m, ka m nwee ike lọtakwa,
nʼihi na ị bụ Onyenwe anyị na Chineke m. 19Mgbe m kpafuru,
echegharịrị m.
Mgbe m ghọtakwara,
e tiri m aka nʼobi m,
ihere mere m, ọ wutekwara m
nʼihi nʼọnọdụ ihe ihere nʼihi ụdị ndụ m biri nʼokorobịa m.’ 20Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke,
onye ihe ya na-atọ m ụtọ?
Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya,
ma anọkwa m na-echeta ya.
Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike.
Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 21“Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama,
manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama.
Lezienụ anya mụta aha okporoụzọ niile,
bụ okporoụzọ unu ga-eso.
Lọta, gị Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,
laghachi nʼobodo gị ndị a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.