Jeremaya 31:21
Jeremiah 31:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama, manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama. Lezienụ anya mụta aha okporoụzọ niile, bụ okporoụzọ unu ga-eso. Lọta, gị Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, laghachi nʼobodo gị ndị a.
Jeremiah 31:21 in English
Jeremiah 31:21 · Berean Standard Bible
“Set up the roadmarks, establish the signposts. Keep the highway in mind, the road you have traveled. Return, O Virgin Israel, return to these cities of yours.
Context
19Mgbe m kpafuru,
echegharịrị m.
Mgbe m ghọtakwara,
e tiri m aka nʼobi m,
ihere mere m, ọ wutekwara m
nʼihi nʼọnọdụ ihe ihere nʼihi ụdị ndụ m biri nʼokorobịa m.’ 20Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke,
onye ihe ya na-atọ m ụtọ?
Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya,
ma anọkwa m na-echeta ya.
Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike.
Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 21“Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama,
manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama.
Lezienụ anya mụta aha okporoụzọ niile,
bụ okporoụzọ unu ga-eso.
Lọta, gị Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,
laghachi nʼobodo gị ndị a. 22Ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-awagharị,
gị nwaagbọghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi Izrel?
Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ime ihe ọhụrụ nʼụwa;
nwanyị ga-anọ nwoke gburugburu.” 23Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru, “Mgbe m si na mba ọzọ kpọghachi ha, ndị ga-ebi nʼala Juda na nʼime obodo ya niile ga-ekwu okwu ndị a ọzọ sị: ‘Onyenwe anyị gọzie gị, gị ebe obibi dị nsọ, gị ugwu dị nsọ.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.