Jeremaya 31:23
Jeremiah 31:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru, “Mgbe m si na mba ọzọ kpọghachi ha, ndị ga-ebi nʼala Juda na nʼime obodo ya niile ga-ekwu okwu ndị a ọzọ sị: ‘Onyenwe anyị gọzie gị, gị ebe obibi dị nsọ, gị ugwu dị nsọ.’
Jeremiah 31:23 in English
Jeremiah 31:23 · Berean Standard Bible
This is what the LORD of Hosts, the God of Israel, says: “When I restore them from captivity,* they will once again speak this word in the land of Judah and in its cities: ‘May the LORD bless you, O righteous dwelling place, O holy mountain.’
Context
21“Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama,
manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama.
Lezienụ anya mụta aha okporoụzọ niile,
bụ okporoụzọ unu ga-eso.
Lọta, gị Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,
laghachi nʼobodo gị ndị a. 22Ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-awagharị,
gị nwaagbọghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi Izrel?
Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ime ihe ọhụrụ nʼụwa;
nwanyị ga-anọ nwoke gburugburu.” 23Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru, “Mgbe m si na mba ọzọ kpọghachi ha, ndị ga-ebi nʼala Juda na nʼime obodo ya niile ga-ekwu okwu ndị a ọzọ sị: ‘Onyenwe anyị gọzie gị, gị ebe obibi dị nsọ, gị ugwu dị nsọ.’ 24Ndị mmadụ ga-ebikọta ọnụ na Juda na nʼobodo niile dị nʼime ya, ma ndị na-arụ ọrụ ubi, ma ndị na-elekọta igwe ewu na atụrụ ha. 25Aga m enwoghakwa ike ndị na-ada mba, meekwa ka afọ ju ndị ike gwụrụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.