Jeremaya 31:22
Jeremiah 31:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-awagharị, gị nwaagbọghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi Izrel? Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ime ihe ọhụrụ nʼụwa; nwanyị ga-anọ nwoke gburugburu.”
Jeremiah 31:22 in English
Jeremiah 31:22 · Berean Standard Bible
How long will you wander, O faithless daughter? For the LORD has created a new thing in the land— a woman will shelter * a man.”
Context
20Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke,
onye ihe ya na-atọ m ụtọ?
Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya,
ma anọkwa m na-echeta ya.
Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike.
Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 21“Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama,
manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama.
Lezienụ anya mụta aha okporoụzọ niile,
bụ okporoụzọ unu ga-eso.
Lọta, gị Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,
laghachi nʼobodo gị ndị a. 22Ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-awagharị,
gị nwaagbọghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi Izrel?
Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ime ihe ọhụrụ nʼụwa;
nwanyị ga-anọ nwoke gburugburu.” 23Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru, “Mgbe m si na mba ọzọ kpọghachi ha, ndị ga-ebi nʼala Juda na nʼime obodo ya niile ga-ekwu okwu ndị a ọzọ sị: ‘Onyenwe anyị gọzie gị, gị ebe obibi dị nsọ, gị ugwu dị nsọ.’ 24Ndị mmadụ ga-ebikọta ọnụ na Juda na nʼobodo niile dị nʼime ya, ma ndị na-arụ ọrụ ubi, ma ndị na-elekọta igwe ewu na atụrụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.