Jeremaya 31:9
Jeremiah 31:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta, ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha. Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi, nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha, nʼihi na aghọọlara m Izrel nna, Ifrem bụkwa ọkpara m.
Jeremiah 31:9 in English
Jeremiah 31:9 · Berean Standard Bible
They will come with weeping, and by their supplication I will lead them; I will make them walk beside streams of waters, on a level path where they will not stumble. For I am Israel’s Father, and Ephraim is My firstborn.”
Context
7Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb,
tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu.
Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ,
‘Onyenwe anyị, biko, zọpụta ndị gị,
bụ ndị Izrel fọdụrụ.’ 8Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha;
aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha.
Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ,
na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme.
Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu! 9Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta,
ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha.
Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi,
nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha,
nʼihi na aghọọlara m Izrel nna,
Ifrem bụkwa ọkpara m. 10“Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu mba niile;
kwusaanụ ya nʼebe dị anya nke ala ahụ dị nʼakụkụ osimiri niile.
Onye ahụ chụsara Izrel ga-achịkọtakwa ha.
Ọ ga-elekọtakwa igwe ewu na atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. 11Nʼihi na Onyenwe anyị ga-agbapụta Jekọb,
ọ ga-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ka ha ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.